News

Ihe nkiri Decolonising na Ọmụmụ nyocha

Igbo translation by Chika Mbah

Ọkara narị afọ agaala kamgbe agụmakwụkwọ ihe Ejije na Ihuenyo malitere, mana akụkọ banyere ya, ọmụmụ ya na usoro nkwudo ya ka gbadokarịrị mkpọrọgwụ n’omenala mba Iroopu. Na agbanyeghị na ndị ọkammụta maka  “ihe nkiri mbaụwa” nakwa “ihe nkiri si na mba fere na mba” anwaala ịgbasawanye usoro iwu na nkwudo ya, ọkpụrụkpụ ihe olemole ka na-eche ha aka mgba.  A ka na-akpachapụ maọbụ gbochie kpamkpam, mkwalite ụdị ihe nkiri ọmụmụ ya si karịrị n’aka ndị bụ ọkara ndịọcha, ma  okacha ndị si na mba Afrịka. Akpamagwa a na-egbobido omaricha mmekorita gaara inye aka chegharịa agụmakwụkwọ ihe Ejije na ihuenyo n’ime oge narị afọ iri abụọ na otu, bụ oge nyekarịrị ohere iji nkanụzụ mepụta ihe ejije, gosipụtakwa ha n’ihuenyo dịga iche iche, bụ ụzọ ‘ụwa ihuenyo’ ji ike oku eme ka ọ kawanye mma. Ọrụ anyị a na-enyocha ‘ụwa ihuenyo’ ndị a (ka esi ede ma na-emepụakwa ha) ọkachasị n’ala Afrịka (nke ka nke na mba Naijiria na Itiopia), ka ọ bụrụ otu ụzọ enwere ike isi mee ka ejije si na mba ndị ana-akpachapụ n’akụkụ nwee ike ịpụtawanye ihe. Anyị ga-akọwapụtakwa ọrụ ndị tulere ‘ụwa ihuenyo’ n’ime ụwa gbaa gburugburu, ọkachasị ‘ụwa ihuenyo’ dịga na Ndịda Ụwa (ọkacha ndị dị n’etiti mba Afrịka na mba Eshia) – ịchọpụta ka ha siri yie onwe ha, ka ha siri dị n’iche n’iche na ka nke si agba n’ọwa nke ya. Ụzọ anyị si saa agwa nkpachapụ n’ihe Ejije na Ihuenyo okwu abụghị naanị site n’ụzọ ndị ọkammụta– ọgbakọ ndị ọkachamara na  idepụta akwụkwọ, kama ọ gbanyekwara iji akọ okike na imega ihe chọọ ụzọ kacha tụ nkọ (dika ịkọcha ihe ejije na imepụta ihe ejije) tọọ anya n’ala mee nchọputa, nke ga-enye aka itichapụ agụmakwụkwọ ihe Ejije na Ihuenyo n’aka ndị kudoro ya (site n’iwepụta ‘akụrụ ngwaọrụ enwere ike iji wepụta usoro agụmagụ na usoro nkuzi ga-aka nọchite anya mmadu niile, mekwaa ka ọnụ rutu onye ọbụla n’okwu). Abịa n’akụkụ nkammụta anyi ga-etinye ọnụ n’icheputa etu okwu echiche dịka “ụwa ihuenyo gasị” (maọbụ okwu echiche ndị ọzọga) nwere ike isi nye aka karịa “ihe ejije mbaụwa” maọbụ “ihe ejije si na mba fere na mba” inyocha ihe gbasagara akụkọ ihe nleta na ngeta, imepụta ha,na ịgbasa ha n’ụwa gbaa gburugburu n’oge ugbua, n’ụdị ha dịga n’iche n’iche.

Share